Psalms 17

Ekpere Devid.

Ekpere maka nnapụta

1O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi,
nụrụkwa mkpu akwa m.
Gee ntị nʼekpere m
nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.
2Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa;
ka anya gị hụ ihe ziri ezi.

3Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m,
i letala m nʼabalị, nwalekwaa m,
ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere,
na ọnụ m ekwuhiebeghị.
4Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị
ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta
nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.
5Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị,
ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.

6Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m;
gee m ntị ma nụrụ ekpere m.
7Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube;
gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta
ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.
8Chebe m dịka mkpụrụ anya gị;
zoo m na ndo nke nku gị,
9site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu,
ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.

10Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri,
okwu ịnya isi juru ha ọnụ.
11Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu,
ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.
12Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa,
dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.

13 Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha.
Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.
14O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a,
site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a.
Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha,
ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a,
ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.

15Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume;
mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
Copyright information for IboBIU